10 Ha we tikue Jehova nkpu, si, Ayi emehiewo, n'ihi na ayi arapuwo Jehova, we fè Bealim na Ashtarot òfùfè: ma ub͕u a naputa ayi n'aka ndi-iro-ayi, ayi gēfè kwa Gi òfùfè.
11 Jehova we zite Jerubeal, na Bedan, na Jefta, na Samuel, we naputa unu n'aka ndi-iro-unu buruburu, unu we biri na ntukwasi-obi.
12 Unu we hu na Nehash, bú eze umu Amom, biara imegide unu, unu we sim, É-è, kama otù eze gāburu ayi eze: ma Jehova, bú Chineke-unu, bu eze-unu.
13 Ma ub͕u a le eze nke unu rọputaworo, onye unu riọrọm n'aka: ma, le, Jehova emewo ka eze nāchi unu.
14 Ọ buru na unu atua egwu Jehova, ọ buru kwa na unu efè Ya òfùfè, we ge nti olu-Ya, ọ buru kwa na unu anupughi isi n'okwu-ọnu Jehova, kama na unu nēsogide Jehova, bú Chineke-unu, ma unu onwe-unu ma eze-unu kwa nke bu eze-unu, ọ di nma:
15 ma ọ buru na unu egeghi nti olu Jehova, kama unu nānupu isi n'okwu-ọnu Jehova, aka Jehova gādi kwa imegide unu, otú ọ di imegide nna-unu-hà.
16 Ub͕u a kwa guzonu onwe-unu, hu ihe uku a, nke Jehova nēme n'anya-unu.