18 Rehoboam we lutara onwe-ya nwunye, bú Mahalat nwa-nwayi Jerimot nwa Devid, na Abihail nwa-nwayi Elaiab nwa Jesi,
19 o we muara ya umu-ndikom; Jeush, na Shemaria, na Zaham.
20 Mb͕e ọ lusiri ya ọ luta-kwa-ra Meaka nwa-nwayi Absalom; o we muara ya Abaija, na Atai, na Ziza, na Shelomit.
21 Rehoboam we hu Meaka nwa Absalom n'anya kari ndinyom-ya nile na iko-ya ndinyom nile: (n'ihi na ndinyom iri na asatọ ka ọ lutara, nwe kwa ọgu iko-ndinyom atọ, o we mua orú umu-ndikom na asatọ na ọgu umu-ndinyom atọ).
22 Rehoboam we guzo Abaija nwa Meaka ibu onye-isi, ọbuná ibu onye-ndú n'etiti umu-nne-ya: n'ihi na ọ di n'obi-ya ime ya eze.
23 O nwe-kwa-ra nghọta, we me ka ufọdu nime umu-ya ndikom nile b͕asa rue ala nile nke Juda na Benjamin, rue obodo ọ bula ewusiri ike: o we nye ha nri n'uba. O we chọ ìgwè ndinyom.