1 N'arọ nke iri-na-asatọ nke eze, bú Jeroboam, ka Abaija malitere ibu eze Juda.
2 Arọ atọ ka ọ bu eze na Jerusalem: aha nne-ya bu Maikaīa nwa-nwayi Uriel nke Gibea. Agha di kwa n'etiti Abaija na Jeroboam.
3 Abaija we were usu-ndi-agha, bú ndi-dike n'agha, bū agha, bú orú nnù ndikom ọgu uzọ abua na uzọ iri, bú ndi arọputara arọputa: ma Jeroboam were orú nnù ndikom ọgu uzọ ise, bú ndi arọputara arọputa, do agha n'usoro imegide ya, ha bu ndi-dike bu dìnkpà.
4 Abaija we bilie n'elu ugwu Zemaraim, nke di n'ugwu Efraim, si, Nurunum, Jeroboam na Israel nile;