12 Ma, le, Chineke nọyere ayi, dika onye-isi-ayi, Ya na ndi-nchu-àjà-Ya, ndi chiri opì ahu, bú nke eji fù ka ha we dasie udà ike, ifù ha ka ha we dasie uda ike megide unu. Umu Israel, unu ebusola Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, agha; n'ihi na ọ gaghi-agara unu nke-ọma.
13 Ma Jeroboam mere ka ndi nēru nbì b͕a buruburu ibia n'azu ha: ha we di n'iru Juda, ma ndi nēru nbì di n'azu ha.
14 Juda we le anya n'azu, ma, le, anēbuso ha agha n'iru na azu: ha we tikue Jehova nkpu, ndi-nchu-àjà nāfù kwa opì.
15 Ndikom Juda we tie nkpu: o rue, mb͕e ndikom Juda tiri nkpu, na Chineke tib͕uru Jeroboam na Israel nile n'iru Abaija na Juda.
16 Umu Israel we si n'iru Juda b͕alaga: Chineke we nye ha n'aka-ha.
17 Abaija na ndi-ya we tib͕ue ha ọtutu ntib͕u: orú nnù ndi eb͕uru eb͕u ọgu uzọ atọ na uzọ abua na nnù iri, bú ndi arọputara arọputa, we dapu n'Israel.
18 Ewe weda umu Israel n'ala na mb͕e ahu, umu Juda we b͕a ume, n'ihi na ha dabere na Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.