2 Madu ufọdu we bia gosi Jehoshafat, si, Ìgwè madu bara uba esiwo n'ofè oké osimiri, site na Siria, bia imegide gi; ma, le, ha nọ nime Hazazon-tema (nke bu En-gedi).
3 Jehoshafat we tua egwu, che iru-ya ichọ Jehova; o we kpọsa obubu-ọnu na Juda nile.
4 Juda we chikọta onwe-ha ichọ iye-aka site n'aka Jehova: ọbuná site n'obodo nile nke Juda ka ha biara ichọsi Jehova ike.
5 Jehoshafat we guzo nime nkpọkọta Juda na Jerusalem, n'ulo Jehova, n'iru ogige ọhu;
6 ọ si, Jehova, bú Chineke nke nna-ayi-hà, ọ̀ bughi Gi onwe-gi bu Chineke n'elu-igwe? ọ̀ bughi Gi onwe-gi nāchi kwa ala-eze nile nke mba nile? ọ bu kwa n'aka-Gi ka ume na idi-ike di, ọ dighi kwa onye gēguzo onwe-ya n'ebe I nọ.
7 Ọ̀ bughi Gi onwe-gi, Chineke-ayi, napuru ndi bi n'ala nka ala-ha n'iru ndi-Gi, bú Israel, were ya nye nkpuru Abraham, bú onye nāhu Gi n'anya, rue mb͕e ebighi-ebi?
8 Ha we biri nime ya, wuere Gi ebe nsọ nime ya nye aha-Gi, si,