13 kama i jewo ije n'uzọ ndi-eze Israel, me Juda na ndi bi na Jerusalem ka ha kwa iko, dika ulo Ehab mere ka akwa iko; ọzọ kwa, umu-nne-gi ndikom, bú ulo nna-gi, ndi di nma kari gi onwe-gi, ka i b͕uworo:
14 le, Jehova nēti ihe-otiti uku n'etiti ndi-gi na n'etiti umu-gi, na n'etiti ndinyom-i, na n'etiti àkù-gi nile:
15 gi onwe-gi kwa, O gēji ọtutu ọria, n'ọria ngiri-afọ-gi, tie gi, rue mb͕e ngiri-afọ-gi gāputa site n'ọria ahu kwa-ubọchi.
16 Jehova we kpọte mọ nke ndi Filistia, na nke Arebia, ndi nọ n'akuku ndi Etiopia, imegide Jehoram:
17 ha we rigo imegide Juda, we tipúe ya, dọta àkù nile ahuru n'ulo eze, na umu-ya ndikom kwa, na ndinyom-ya, n'agha; ọ dighi kwa nwa-nwoke fọduru ya, ọ bu nání Jehoahaz, bú nke-ntà nime umu-ya ndikom.
18 Ma mb͕e ihe nile a gasiri Jehova were ọria nke nādighi ngwọta tie ya na ngiri-afọ-ya.
19 O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri, ọbuná na mb͕e ọgwugwu arọ abua gasiri, na ngiri-afọ-ya putara n'ọria-ya, o we nwua n'ajọ ọria. Ma ndi-ya esureghi nsure-ọku nye ya dika nsure-ọku nke nna-ya-hà.