4 Jehoram we bilie ibu onye-isi ala-eze nna-ya, o we me onwe-ya ka ọ di ike, were mma-agha b͕ue umu-nne-ya ndikom nile, ọzọ kwa, o b͕uru ufọdu nime ndi-isi Israel.
5 Orú arọ na iri na abua ka Jehoram b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ asatọ na Jerusalem.
6 O je ije n'uzọ ndi-eze Israel, dika ulo Ehab mere: n'ihi na ọ bu nwa-nwayi Ehab ka ọ nwere na nwunye: o we me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova.
7 Ma Jehova ekweghi ibibi ulo Devid, n'ihi ọb͕ub͕a-ndu ahu Ya na Devid mere, dika Ọ si-kwa-ra na Ọ gēnye ya oriọna, nye kwa umu-ya, ubọchi nile.
8 N'ubọchi-ya ka Edom siri n'okpuru aka Juda jehie, mere onwe-ha eze.
9 Jehoram we gabiga, ya na ndi-isi-ya, ub͕ọ-ala-ya nile so-kwa-ra ya: o rue na o biliri n'abali, tib͕ue Edom ndi nāb͕a ya buruburu, ha na ndi-isi ub͕ọ-ala.
10 Edom we si n'okpuru aka Juda jehie, rue ta: mb͕e ahu ka Libna siri n'okpuru aka-ya jehie n'otù mb͕e ahu: n'ihi na ọ rapuru Jehova, bú Chineke nke nna-ya-hà.