6 Ma ka onye ọ bula ghara ibà n'ulo Jehova, ọ bu nání ndi-nchu-àjà, na ndi n'etiti ndi Livai ndi nēje ozi; ndi ahu gābà, n'ihi na ndi nsọ ka ha bu: ma ndi Juda nile gēdebe ihe-ndebe ulo Jehova.
7 Ndi Livai gānọ kwa eze buruburu, nwoke ọ bula na ihe-agha-ya n'aka-ya; ma onye nābata n'ulo, ka eme ka ọ nwua: unu nọye-kwa-ra eze mb͕e ọ nābà nime, na mb͕e ọ nāpu n'èzí.
8 Ndi Livai na Juda nile we me dika ihe nile si di nke Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, nyere n'iwu: ha we chiri, nwoke ọ bula ndikom-ya, bú ndi nābà nime n'ubọchi-izu-ike, ha na ndi nāpu apu n'ubọchi-izu-ike; n'ihi na Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, emeghi ka òkè di iche iche pua n'ije-ozi-ha.
9 Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, we nye ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise ube, na ọta, na ọta ntà, nke eze, bú Devid, nwereri, nke di n'ulo Chineke.
10 O guzo ndi Juda nile, nwoke ọ bula na ihe-agha-ya n'aka-ya, site n'akuku aka-nri ulo ahu rue akuku aka-ekpe ulo ahu, n'akuku ebe-ichu-àjà na n'akuku ulo, n'akuku eze buruburu.
11 Ha we me ka nwa eze puta, ha we kpube ya okpu-eze, nye ya ihe-àmà, me ya eze: Jehoiada na umu-ya ndikom we te ya manu; ha we si, Ka eze di ndu.
12 Atalaia we nu olu ndi Juda ka ha nāb͕a ọsọ nēto kwa eze, o we biakute ndi ahu n'ulo Jehova: