7 N'ihi na Atalaia, bú nwayi ahu nēmebi iwu, umu-ya ndikom tipúru ulo Chineke; ọzọ kwa, ha were ihe nsọ nile nke ulo Jehova nye Bealim.
8 Eze we gwa ha, ha we me otù ib͕e, dọba ya n'ọnu-uzọ-ama ulo Jehova n'èzí.
9 Ha we kpọsa na Juda na nime Jerusalem, ka ewebatara Jehova utu nke Moses, bú orù Chineke, tukwasiri Israel n'ọzara.
10 Ndi-isi nile na ndi Juda nile we ṅuria ọṅu, webata ihe, tubà ya n'ib͕e ahu, rue mb͕e ha nyebìri.
11 O rue, mb͕e ebubatara ib͕e ahu n'ulo-nlekọta eze site n'aka ndi Livai, mb͕e ha hu-kwa-ra na ego ahu riri nne, na ode-akwukwọ eze na onye-nlekọta nke onye-isi-nchu-àjà biara, wupu ihe di n'ib͕e, būru ya, bughachi ya n'ọnọdu-ya. Otú a ka ha mere kwa-ubọchi, ha we chikọta ego n'uba.
12 Eze na Jehoiada we were ya nye ndi nēje ozi òfùfè ulo Jehova; ha we nēgo ndi nāwa nkume na ndi-ọ̀kà n'osisi ime ka ulo Jehova di ọhu, ha were kwa ya nye ndi-ọ̀kà n'ígwè na ọla ime ka ulo Jehova di ike.
13 Ndi nēje ozi ahu we lua ọlu, ewe jezue ozi ahu n'aka-ha, ha we guzo ulo Chineke dika ọtùtù-ya si di, me ka o sie ike.