17 Amazaia, bú eze Juda, we nara idu-ọdu, zigara Joash nwa Jehoahaz, nwa Jihu, bú eze Israel, ozi, si, Bia, ka ayi lerita onwe-ayi anya n'iru.
18 Joash, bú eze Israel, we zigara Amazaia, bú eze Juda, ozi, si, Uke nke di na Lebanon zigara osisi cedar nke di na Lebanon ozi, si, Nye nwam nwoke nwa-gi nwayi na nwunye: anu-ọhia nke di na Lebanon we gabiga, zọpia uke ahu.
19 I siwo, Le, i tib͕uwo Edom; obi-gi we bulie gi elu isọpuru onwe-gi: ub͕u a nọdu n'ulo-gi; n'ìhi gini ka i nākpali onwe-gi n'ihe ọjọ, ka i we da, gi onwe-gi, na Juda soro gi?
20 Ma Amazaia anughi; n'ihi na Chineke ka o sitere, ka O we nye ha n'aka ndi-iro-ha, n'ihi na ha chọrọ chi Edom.
21 Joash, bú eze Israel, we rigo; ya onwe-ya na Amazaia, bú eze Juda, we lerita onwe-ha anya n'iru na Bet-shemesh, nke Juda nwere.
22 Ewe tib͕ue Juda n'iru Israel; ha we b͕alaga, nwoke ọ bula n'ulo-ikwū-ya.
23 Joash, bú eze Israel, we Jide Amazaia, bu eze Juda, nwa Joash nwa Jehoahaz, nime Bet-shemesh, me ka ọ biarue Jerusalem, we tipue mb͕idi Jerusalem site n'ọnu-uzọ-ama Efraim rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku, nnù cubit.