6 Jotam we me onwe-ya ka ọ di ike, n'ihi na o doziri uzọ-ya nile n'iru Jehova, bú Chineke-ya.
7 Ma ihe nile nke Jotam mere nke fọduru, na agha-ya nile, na uzọ-ya nile, le, edewo ha n'akwukwọ ndi-eze Israel na Juda.
8 Orú arọ na ise ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze, o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem.
9 Jotam we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya n'obodo Devid: Ehaz nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.