13 ha we si ha, Unu agaghi-ewebata ndọta-n'agha ahu n'ebe a: n'ihi na tukwasi ikpe-ọmuma Jehova nke mara ayi, unu onwe-unu nāsi na unu gātukwasi ihe na nmehie nile ayi na n'ikpe-ọmuma-ayi: n'ihi na o riri nne, bú ikpe-ọmuma mara ayi, iwe di ọku di kwa n'aru Israel.
14 Ndi ejikere agha we rapu ndọta-n'agha ahu na ihe-nluta-n'agha ahu n'iru ndi-isi na nkpọkọta ahu nile.
15 Ndikom ahu ndi akpọrọ n'aha n'aha we bilie, jide ndọta-n'agha ahu, yikwasi ndi-ha b͕ara ọtọ uwe site n'ihe-nkwata ahu, ha we yikwasi ha uwe, yikwasi kwa ha akpukpọ-ukwu, me ha ka ha rie ihe, me kwa ha ka ha ṅua ihe-ọṅuṅu, te ha manu, nēdu ha n'elu inyinya-ibu, bú onye ọ bula nāsu ngọngọ, ha we me ka ha biarue Jeriko, bú obodo ukwu, di umu-nne-ha nso: ha we laghachi na Sameria.
16 Na mb͕e ahu ka eze, bú Ehaz, zigara ndi-eze Asiria ozi ka ha yere ya aka.
17 Ndi Edom bia-kwa-ra ọzọ tib͕ue Juda, we dọta ndọta-n'agha n'agha.
18 Ndi Filistia batakwara n'obodo nile nke ebe di ala ala, na nke Negeb nke diri Juda, ha were kwa Bet-shemesh, na Ajalon, na Gedirot, na Soko na umu-obodo-ya, na Timna na umu-obodo-ya, na Gimzo na umu-obodo-ya: ha we biri n'ebe ahu.
19 N'ihi na Jehova mere ka Juda ruru ala, n'ihi Ehaz, bú eze Israel; n'ihi na o mere ka Juda ghara idi nchikọta, o we mekpu emekpu nke-uku megide Jehova.