5 Jehova, bú Chineke-ya, we nye ya n'aka eze Siria; ha we tib͕ue ya, si nime ndi-ya dọta ndọta-n'agha uku, me ka ha biarue Damaskọs. Ọzọ kwa, n'aka eze Israel ka enyere ya, o we tib͕ue ya oké ntib͕u.
6 Peka nwa Remalaia b͕uru nime Juda orú nnù ndikom uzọ iri-na-ise n'otù ubọchi, ha nile bu ndi-dìnkpà; n'ihi na ha rapuru Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.
7 Zikri, bú dike nke Efraim, we b͕ue Maaseia nwa eze, na Azrikam, bú onye-ndú nke ulo, na Elkena nke bu-kwa-ra eze dika onye nke-abua.
8 Umu Israel we dọta n'agha nime umu-nne-ha orú nnù madu orú uzọ na uzọ ise, bú ndinyom, na umu-ndikom, na umu-ndinyom, ọzọ kwa, ọtutu ihe-nkwata ka ha lutara n'aka-ha n'agha, ha we webata ihe-nkwata ahu na Sameria.
9 Ma otù onye-amuma Jehova nọ n'ebe ahu, Oded bu aha-ya: ọ pua izute usu-ndi-agha ahu nke nābiaru Sameria, ọ si ha, Le, ọ bu n'ihi na Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, kosara Juda ọnuma, ka O nyere ha n'aka-unu, unu we were ọnuma nke ruru elu-igwe b͕ue ha.
10 Ma ub͕u a unu onwe-unu nāsi na unu gāzọda umu Juda na Jerusalem ka ha ghọrọ unu ndi-orù na ndinyom nēje ozi: ma unu onwe-unu, ìhe ikpe-ọmuma adighi kwa n'etiti unu n'ebe Jehova, bú Chineke-unu, nọ?
11 Ma ub͕u a nurunum, zighachi ndọta-n'agha ahu, nke unu dọtara n'agha site n'umu-nne-unu: n'ihi na iwe di ọku nke Jehova di n'aru unu.