18 Ha we ba nime biakute Hezekaia, bú eze, si, Ayi emewo ka ulo Jehova nile di ọcha, ya na ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, na ihe-ya nile, na Table achicha anēdo n'usoro, na ihe-ya nile.
19 Ihe nile kwa nke eze, bú Ehaz, juru aju mb͕e ọ bu eze mb͕e o mekpuru emekpu, ndia ka ayi doziworo, do kwa nsọ; ma, le, ha di n'iru ebe-ichu-àjà Jehova.
20 Hezekaia, bú eze, we bilie n'isi-ututu, chikọta ndi-isi obodo, rigorue ulo Jehova.
21 Ha we webata oke-ehi asa, na ebulu asa, na umu-aturu asa, na nkpi asa, ibu àjà-nmehie n'ihi ala-eze, na n'ihi ebe nsọ ahu, na n'ihi Juda. Ọ si umu Eron, bú ndi-nchu-àjà, ka ha sure ha ọku n'elu abe-ichu-àjà Jehova.
22 Ha we b͕ue oke-ehi asa ahu, ndi-nchu-àjà we nara ọbara-ha, wusa n'ebe-ichu-àjà: ha b͕u-kwa-ra ebulu asa ahu, wusa ọbara-ha n'ebe-ichu-àjà: ha b͕u-kwa-ra umu-aturu ahu, wusa ọbara-ha n'ebe-ichu-àjà.
23 Ha we weta nkpi asa nke àjà-nmehie nso n'iru eze na nkpọkọta Juda; ha we bikwasi ha aka-ha:
24 ndi-nchu-àjà we b͕ue ha, were ọbara-ha chua àjà-nmehie n'ebe-ichu-àjà, ikpuchiri Israel nile nmehie: n'ihi na eze siri, Ọ diri Israel nile, bú àjà-nsure-ọku a na àjà-nmehie a.