6 O were kwa nkume di oké ọnu-ahia n'ima-nma machita ulo ahu: ọla-edo-ya bu kwa ọla-edo Pavaim.
7 O were kwa ọla-edo kpuchie ulo ahu, bú ntuhie-ya nile, na nbata-uzọ-ya nile, na mb͕idi-ya nile, na ibo-ọnu-uzọ-ya nile; o b͕u-kwa-ra eb͕ub͕u cherubim na mb͕idi-ya nile.
8 O me-kwa-ra ulo nsọ kachasi ulo nsọ nile; ogologo-ya di orú cubit, n'iru obosara ulo ahu, obosara-ya di kwa orú cubit: o were ezi ọla-edo, ra ka nnù talent na ọgu iri, kpuchie ya.
9 Ọtùtù ǹtú-ya nile di ọgu shekel ọla-edo abua na iri. O were kwa ọla-edo kpuchie ime-ulo-elu nile.
10 O me kwa cherubim abua, bú ihe emere dika ihe apiri api, n'ulo nsọ ahu kachasi ulo nsọ nile; ha machita ha ọla-edo.
11 Ma nkù cherubim ahu, ogologo-ha di orú cubit: nkù otù cherub di cubit ise, nēmetu mb͕idi ulo ahu; nkù-ya nke-ọzọ di kwa cubit ise, nēmetu nkù cherub nke-ọzọ.
12 Nkù cherub nke-ọzọ di kwa cubit ise, nēmetu mb͕idi ulo: nkù-ya nke-ọzọ di cubit ise, nārapara na nkù cherub nke-ọzọ.