25 Ma ọ bughi dika nmeso emesoro ya ka Hezekaia nyeghachiri; n'ihi na obi-ya di elu: iwe we dikwasi ya, dikwasi kwa Juda na Jerusalem.
26 Hezekaia we ruru ala n'ihi idi-elu nke obi-ya, ya onwe-ya na ndi bi na Jerusalem, iwe Jehova abiakwasighi kwa ha n'ubọchi Hezekaia.
27 Hezekaia we nwe àkù na nsọpuru riri nne nke-uku: o we mere onwe-ya ulo-àkù idebe ọla-ọcha, na idebe ọla-edo, na idebe nkume di oké ọnu-ahia, na idebe uda di iche iche, na idebe ọta, na idebe ihe nile anāchọsi ike;
28 o me-kwa-ra ulo nchikọbata-ihe idebe omume ọka na manya-vine ọhu na manu; na ulo anu nile ọ bula di iche iche, na ìgwè aturu n'ulo-anu.
29 O we mere onwe-ya obodo di iche iche, na ihe-nnweta, bú ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, n'uba: n'ihi na Chineke nyere ya àkù bara uba nke-uku.
30 Hezekaia nka b͕ochi-kwa-ra isi-iyi miri Gaihon di n'elu, we me ka miri ahu rùdazie n'akuku Ọdida-anyanwu obodo Devid. Ihe nāga-kwa-ra Hezekaia nke-ọma n'ọlu-ya nile.
31 Otú ọ di, n'okwu ndi-ukọ nke ndi-isi Babilon, ndi zitere ya ozi iju ajuju bayere ihe-ebude nke mere n'ala, Chineke rapuru ya inwa ya, ka O we mara ihe nile di n'obi-ya.