15 O wezuga-kwa-ra chi nile nke ala ọzọ, si kwa n'ulo Jehova wezuga oyiyi-ihe ahu, ya na ebe-ichu-àjà nile nke o wuru n'ugwu ulo Jehova, na nime Jerusalem, o kpofue ha n'azu obodo.
16 O wue ebe-ichu-àjà Jehova, chua n'elu ya àjà, bú àjà-udo na àjà-ekele, ọ si Juda ka ha fè Jehova, bú Chineke Israel, òfùfè.
17 Otú ọ di, ndi Juda nọ nāchu àjà n'ebe di elu nile, ma ọ bu nání nye Jehova, bú Chineke-ha.
18 Ma ihe nile Manase mere nke fọduru, na ekpere-ya o kpere Chineke-ya, na okwu nile nke ndi-ọhu-uzọ, bú ndi gwara ya okwu n'aha Jehova, bú Chineke Israel, le, edewo ha n'akwukwọ ihe ndi-eze Israel mere.
19 Ekpere-ya kwa, na otú ekwere ka ọ riọta ìhe, na nmehie-ya nile, na nmekpu-ya, na ebe nile nke o wuru ebe di elu nime ha, guzo kwa Asherim na arusi apiri api, tutu o ruru ala: le, edewo ha n'akwukwọ okwu Hozai.
20 Manase we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya, n'ulo-ya: Emon nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.
21 Emon b͕ara orú arọ na abua mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ abua nime Jerusalem.