6 Onye ahu me-kwa-ra ka umu-ya ndikom gabiga nime ọku nime ndagwurugwu nwa Hinom: o ji-kwa-ra igwe-oji tu isi ọma na isi ọjọ, ọ b͕a-kwa-ra afa, me ihe-mb͕asi, meso onye nāju mọ ihe na ndi-dibia-afa: o mere ihe jọrọ njọ n'anya Jehova ri nne, ikpasu Ya iwe.
7 Ọ dọba-kwa-ra arusi apiri api nke oyiyi-ihe ahu, bú nke o mere, n'ulo Chineke, bú nke Chineke siri Devid, si kwa Solomon nwa-ya, Ṅ'ulo a, na nime Jerusalem, nke M'rọputaworo n'ebo nile nke Israel, ka M'gētiye aham rue mb͕e ebighi-ebi:
8 M'gaghi-esi kwa n'elu ala nke M'guzoro nye nna-unu-hà wezuga ukwu Israel ọzọ: nání ọ buru na ha elezi anya ime nile nke M'nyeworo ha n'iwu, bú iwu ahu nile na ukpuru nile na ikpé nile nke sitere n'aka Moses.
9 Manase we me ka Juda na ndi bi na Jerusalem sihie uzọ, ime ihe ọjọ kari mba ọzọ, bú ndi Jehova kpochapuru n'iru umu Israel.
10 Jehova we gwa Manase okwu, gwa kwa ndi-ya: ma ha aṅaghi nti.
11 Jehova we me ka ndi-isi usu-ndi-agha nke eze Asiria nwere biakwasi ha, ha we jide Manase n'ọhia-ogwu, were ihe ọla eji ke ukwu ab͕u ke ya ab͕u, me ka o jerue Babilon.
12 Ma mbe anākpab͕u ya, ọ chọ ka iru Jehova, bú Chineke-ya, dajua, we ruru ala nke-uku n'iru Chineke nke nna-ya-hà.