6 O me-kwa-ra otú a n'obodo nile nke Manase na Efraim na Simeon, we rue Naftali, nime nkpọnkpọ-ebe-ha nile buruburu.
7 Ọ kwatue ebe-ichu-àjà nile, tipia Asherim na arusi nile apiri api, ha we ghọ uzuzu, o b͕utu-kwa-ra arusi-anyanwu nile n'ala Israel nile, we lata na Jerusalem.
8 Ma n'arọ nke-iri-asatọ nke ọ bu eze, mb͕e ọ mesiri ka ala-ya na ulo ahu di ọcha, o zigara Shefan nwa Azalia, na Maaseia, bú onye-isi obodo ahu, na Joa nwa Joahaz, bú onye-ncheta, ime ulo Jehova, bú Chineke, ka ọ di ike.
9 Ha we biakute Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, nye ya ego ahu nke anēwebata n'ulo Chineke, nke ndi Livai, bú ndi nēche nbata-uzọ, chikọtara n'aka ndi Manase na Efraim, na n'aka ndi nile fọduru nke Israel, na n'aka Juda na Benjamin nile na ndi bi na Jerusalem.
10 Ha we nye ya n'aka ndi nēje ozi ahu, bú ndi nēlekọta ihe n'ulo Jehova; ndi nēje ozi ahu, bú ndi nālu ọlu n'ulo Jehova, we nye ya iji mezi ebe etipúru etipú na ime ka ulo ahu di ike;
11 ha we nye ya ndi-ọ̀kà n'osisi, nye kwa ndi nēwu ulo, iji zuta nkume awara awa, na osisi iji me ihe-njikọta, na ijikọta ulo nile nke ndi-eze Juda bibiri.
12 Ndikom ahu nālu ọlu n'ikwesi-ntukwasi-obi n'ozi ahu: ndi-nlekọta-ha bu kwa Jahat na Obadaia, ndi Livai, ndi sitere n'umu Merari; na Zekaraia na Meshulam, ndi sitere n'umu ndi Kohat, ibu ndi-isi: na ndi Livai ọzọ, bú ndi nile nwere nghọta n'ihe abù.