10 Ọ dighi ihe di n'ib͕e ahu, ọ bu nání mbadamba nkume abua nke Moses tiyere nime ha na Horeb, mb͕e Jehova na umu Israel b͕ara ndu, mb͕e ha siri n'Ijipt puta.
11 O rue, mb͕e ndi-nchu-àjà siri n'ebe nsọ puta, (n'ihi na ndi-nchu-àjà nile ahuru doro onwe-ha nsọ, ọ dighi onye ọ bula idebe ihe n'òkè n'òkè;
12 ọzọ, ndi Livai, bú ndi-ọbù-abù, ọbuná ha nile, bú Esaf na Himan, na Jedutun, na umu-ha ndikom, na umu-nne-ha, nēguzo kwa n'akuku ọwuwa-anyanwu nke ebe-ichu-àjà ahu, yiri ezi ákwà ọcha, chiri kwa ájà na une na ubọ-akwara, ọgu ndi-nchu-àjà isi ndi nāfù opi so-kwa-ra ha:)
13 o we rue, mb͕e ndi nāfù opì na ndi-ọbù-abù di ka otù onye, ime ka anu otù olu n'ito na n'ikele Jehova, mb͕e ha were kwa opì na ájà, na ihe abù, na otuto eji to Jehova, welie olu-ha elu, si, N'ihi na Ọ di nma: n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: na igwe-oji juputara ulo ahu, bú ulo Jehova,
14 ndi-nchu-àjà we ghara inwe ike iguzo ije ozi n'ihi igwe-oji ahu: n'ihi na ebube Jehova juputara ulo Chineke.