24 Ọ buru kwa na etib͕ue ndi-Gi, bú Israel, n'iru onye-iro, n'ihi na ha nēmehie megide gi; ọ buru kwa na ha alaghachi, kwuputa aha-Gi, kpe ekpere, riọ amara n'iru Gi n'ulo a:
25 Gi onwe-gi si kwa n'elu-igwe nuru, b͕aghara nmehie ndi-Gi, bú Israel, me ka ha lata n'ala nke I nyere ha, nye kwa ndi bu nna-ha.
26 Mb͕e eb͕ochiri elu-igwe, mb͕e miri-ozuzo nādighi kwa, n'ihi na ha nēmehie megide Gi; ọ buru na ha ekpe ekpere n'ebe ebe a di, kwuputa aha-Gi, si na nmehie-ha laghachi, n'ihi na I nēweda ha n'ala:
27 Gi onwe-gi nuru kwa n'elu-igwe, b͕aghara nmehie ndi-orù-Gi, na nke ndi-Gi, bú Israel, n'ihi na I nēzí ha ezi uzọ nke ha ganēje ije nime ya; Gi me kwa ka miri zokwasi ala-Gi, nke I nyeworo ndi-Gi ibu ihe-nketa.
28 Mb͕e oké unwu gādi n'ala, mb͕e ajọ ọria nke nēfe efe gādi, mb͕e nchakpọ gādi, ma-ọbu ọmuma-ebu, ma-ọbu igurube, ma-ọbu ọbubu; mb͕e ndi-iro-ha gānọchigide ha n'agha n'ala nke ọnu-uzọ-ama nile ha; ihe-otiti ọ bula, ma-ọbu ọria ọ bula;
29 ekpere ọ bula, aririọ-amara ọ bula, nke gādiri madu ọ bula, ma-ọbu nke gādiri ndi-Gi nile, bú Israel, ndi gāmara, nwoke ọ bula ihe-otiti-ya na ihe-nb͕u-ya, o we b͕asa ọbu-aka-ya abua n'ebe ulo a di:
30 Gi onwe-gi si kwa n'elu-igwe, bú ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, nuru, b͕aghara, nye nwoke ọ bula dika uzọ-ya nile si di, onye I mara obi-ya; (n'ihi na Gi onwe-gi amawo obi umu madu, nání Gi;)