9 O nye eze ọgu talent ọla-edo isi, na uda di iche iche n'uba nke-uku, na nkume di oké ọnu-ahia: ọ dighi uda di ka uda ahu nke eze-nwayi Sheba nyere eze, bú Solomon.
10 Ọzọ kwa, ndi-orù Huram, na ndi-orù Solomon, ndi siri n'Ofia bubata ọla-edo, bubatara osisi algum na nkume di oké ọnu-ahia.
11 Eze we were osisi algum ahu mere ulo Jehova, me-kwa-ra ulo eze, ebe-njeghari di elu, o were kwa ha mere ndi nābù abù ubọ-akwara na une: akāhughi osisi dika osisi ahu n'ala Juda.
12 Eze, bú Solomon, nye-kwa-ra eze-nwayi Sheba ihe nile nātọ ya utọ, ihe ọ bula ọ riọrọ, nāgughi ihe o butere eze. O we chigharia, la n'ala-ya, ya onwe-ya na ndi-orù-ya.
13 Ma ọtùtù ọla-edo nke biakutere Solomon n'otù arọ di nnù talent ọla-edo na ọgu iri-na-atọ na isi;
14 nāgughi ihe ndikom ndi nējeghari izu ahia na ndi-ahia wetara: eze nile nke Arebia na ndi nāchi ala nēweta-kwa-ra Solomon ọla-edo na ọla-ọcha.
15 Eze, bú Solomon, we me ọgu ọta uku iri, ha bu ọla-edo etisara etisa: nnù Shekel ọla-edo etisara etisa na ọgu iri bàra n'otù ọta uku.