6 N'ihi na Onwe-nwe-ayi mere ọmuma-ulo-ikwū Siria ka ha nu olu ub͕ọ-ala, na olu inyinya, bú olu oké usu-ndi-agha: ha we sirita onwe-ha, Le, eze Israel egowo ndi-eze ndi Het, na ndi-eze Ijipt, imegide ayi, ibiakwasi ayi.
7 Ha we bilie, b͕alaga n'ururuchi, rapu ulo-ikwū nile ha, na inyinya nile ha, na inyinya-ibu nile ha, ọbuná ọmuma-ulo-ikwū-ha otú di, b͕alaga n'ihi ndu-ha.
8 Ndi-ekpenta ahu we biarue nsọtu ọmuma-ulo-ikwū, ba n'otù ulo-ikwū, rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, si n'ebe ahu chiri ọla-ọcha, na ọla-ebo, na uwe, je zo ha; ha we biaghachi, ba n'ulo-ikwū ọzọ, si n'ebe ahu chiri kwa ihe, je zo ha.
9 Ha we sirita onwe-ha, Ọ bughi ihe ziri ezi ka ayi onwe-ayi nēme: ubọchi ta, ubọchi ozi ọma ka ọ bu, ma ayi onwe-ayi nāb͕a nkiti: ọ buru na ayi echere rue ìhè ututu, ajọ omume-ayi gāchọputa ayi: ma ub͕u a bianu, ka ayi ba gosi ulo eze.
10 Ha we bia, kpọ onye-ọnu-uzọ-ama obodo òkù, gosi ha, si, Ayi bara n'ọmuma-ulo-ikwū Siria, ma, le, ọ dighi nwoke nọ n'ebe ahu, ọ dighi kwa olu madu di, ma inyinya elibere elibe, na inyinya-ibu elibere elibe, na ulo-ikwū otú ha di.
11 O we kpọ ndi-ọnu-uzọ-ama; ha we gosi ya ulo eze nime.
12 Eze we bilie n'abali, si ndi-orù-ya, Biko, ka m'gosi unu ihe Siria meworo ayi. Ha mara na agu nāgu ayi onwe-ayi, ha we si n'ọmuma-ulo-ikwū-ha pua izo onwe-ha n'ọhia, si, Mb͕e ha siri n'obodo puta, ayi gējide ha na ndu, ba n'obodo-ha.