12 Ndi-eze uwa ekweghi, ndi nile bi n'elu-uwa dum madu bi ekweghi kwa,Na onye-nkpab͕u na onye-iro gābà n'ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem.
13 O sitere na nmehie nile nke ndi-amuma-ya, na ajọ omume nile nke ndi-nchu-àjà-ya,Ndi nāwusi ọbara ndi ezi omume n'etiti ya.
14 Ha aṅaghariwo dika ndi-ìsì n'èzí nile, ejiwo ọbara meru ha,Madu we ghara inwe ike imetu uwe-ha aka.
15 Wezuganu onwe-unu, ka ha kpọrọ ha òkù, Onye ruru árú! wezuganu onwe-unu, wezuganu onwe-unu, unu emetula aka:Mb͕e ha b͕apuru ha ṅaghari-kwa-ra; madu siri n'etiti mba nile, Ha agaghi-anọ kwa ọnọdu-abali ọzọ n'ebe a.
16 Iru Jehova ekesawo ha; Ọ gaghi-elegide kwa ha anya ọzọ:Madu ahughi ndi-nchu-àjà iru-ọma, ha emeghi ndi-okenye amara.
17 Anya-ayi nādala n'isi rue ub͕u a n'ile anya iye-aka efu ayi:N'iche-nche-ayi ayi echewo nche mba nke nādighi-azọputa.
18 Ha achuwo ntá nzọ-ukwu nile ayi, ayi we ghara ijeghari n'amá nile ayi;Ọgwugwu-ayi di nso, ubọchi nile ayi eruzuwo; n'ihi na ọgwugwu-ayi abiawo.