14 Ha aṅaghariwo dika ndi-ìsì n'èzí nile, ejiwo ọbara meru ha,Madu we ghara inwe ike imetu uwe-ha aka.
15 Wezuganu onwe-unu, ka ha kpọrọ ha òkù, Onye ruru árú! wezuganu onwe-unu, wezuganu onwe-unu, unu emetula aka:Mb͕e ha b͕apuru ha ṅaghari-kwa-ra; madu siri n'etiti mba nile, Ha agaghi-anọ kwa ọnọdu-abali ọzọ n'ebe a.
16 Iru Jehova ekesawo ha; Ọ gaghi-elegide kwa ha anya ọzọ:Madu ahughi ndi-nchu-àjà iru-ọma, ha emeghi ndi-okenye amara.
17 Anya-ayi nādala n'isi rue ub͕u a n'ile anya iye-aka efu ayi:N'iche-nche-ayi ayi echewo nche mba nke nādighi-azọputa.
18 Ha achuwo ntá nzọ-ukwu nile ayi, ayi we ghara ijeghari n'amá nile ayi;Ọgwugwu-ayi di nso, ubọchi nile ayi eruzuwo; n'ihi na ọgwugwu-ayi abiawo.
19 Ndi nāchu ayi di garagara kari ugo nke elu-igwe:N'elu ugwu nile ka ha churu ayi n'ọku ọku, n'ọzara ka ha chere ayi anwu.
20 Ume nke oghere-imi-ayi, bú onye Jehova etere manu, ka ejidere n'olùlù-ha;Onye ayi siri, N'okpuru ǹdò-ya ka ayi gādi ndu n'etiti mba nile.