Daniel
isiakwụkwọ 1:18-21
Bible Nso
18Ma n'ọgwugwu ubọchi ndia nke eze siri ka eme ka ha bata, onye-isi ndi-onozi we me ka ha bata n'iru Nebukadneza.
19Eze we kpayere ha uka; ma ahughi n'etiti ha nile onye ọ bula di ka Daniel na Hananaia na Mishael na Azaraia: ha we guzo n'iru eze.
20Ma n'okwu ọ bula nke amam-ihe nke nghọta, nke eze chọrọ n'aka ha, ọ huru na ha ka ndi-ode-akwukwọ di nsọ nile na ndi-dibia nile ndi nọ n'ala-eze-ya nile nma ub͕ò iri.
21Daniel we nọgide rue arọ mbu nke Sairọs, bú eze.