4 bú umu-okoro nke ọ dighi ọlu ọ bula di ha n'aru, ndi mara nma n'ile anya, nwe uche n'amam-ihe nile, mara ihe-ọmuma, nāghọta ihe anāma ama, ndi nwe-kwa-ra ike iguzo n'ulo uku eze; ọ si-kwa-ra ya ka o me ka ha muta akwukwọ na asusu nke ndi Kaldea.
5 Eze we keputara ha òkè nke ubọchi ọ bula n'ubọchi-ya site n'ihe-oriri ọma nke eze, na site na manya-vine nke ọ nāṅu, si ka eme ka ha toputa arọ atọ, ka ha we guzo n'iru eze n'ọgwugwu arọ atọ ahu.
6 Ma n'etiti ha ka umu Juda ufọdu di, bú Daniel, na Hananaia, na Mishael, na Azaraia.
7 Onye-isi ndi-onozi we gua ha aha: o we gua Daniel aha Belteshaza, gu kwa Hananaia aha Shedrak, gu kwa Mishael aha Mishak, gu kwa Azaraia aha Abed-nego.
8 Daniel we tiye nka n'obi-ya na ọ gaghi-ewere ihe-oriri ọma eze ma-ọbu manya-vine ọ nāṅu me onwe-ya ka ọ ghara idi nsọ: o we chọ n'aka onye-isi ndi-onozi ka ọ ghara ime onwe-ya onye nādighi nsọ.
9 Chineke we nye Daniel ka enwe ebere na obi-ebere nile n'aru ya n'iru onye-isi ndi-onozi.
10 Onye-isi ndi-onozi we si Daniel, Mu onwem nātu egwu onye-nwem, bú eze, onye keputaworo ihe-oriri-unu na ihe-ọṅuṅu-unu: n'ihi na ọ̀ bú n'ihi gini ka ọ gāhu iru-unu ka ha b͕aruru kari iru umu-okoro ndi-ọb͕ọ-unu? unu ewe me ka eze nara isim na nrà.