32 Ọ bu kwa ndi nēmebi iwu megide ọb͕ub͕a-ndu ahu ka ọ gēmeru site n'ire-utọ di iche iche: ma ndi ahu nke mara Chineke-ha gādi ike, me ihe.
33 Ọzọ, ndi nwere uche n'etiti ndi Chineke gēme ka ọra madu ghọta ihe: ma ha gāsu ngọngọ site na mma'agha, site kwa n'ire-ọku, site kwa na ndọta-n'agha, site kwa na nluta-n'agha, ọtutu ubọchi.
34 Ma mb͕e ha nāsu ngọngọ agēyere ha aka nke-ntà: ma ọtutu madu gēji ire-utọ di iche iche rapara ha n'aru.
35 Ọzọ, ufọdu nime ndi ahu nwere uche gāsu ngọngọ, inucha ha, na ime ka ha di ọcha, na ime ka ha nwue ọcha, rue mb͕e ọgwugwu ihe ndia: n'ihi na ọ fọduru idi na mb͕e akara àkà.
36 Eze ahu gēme kwa ka o si tọ ya; ọ gēbuli kwa onwe-ya, me onwe-ya uku n'elu chi nile ọ bula, ọ bu kwa Chineke nke chi nile ka ọ gēkwu oké okwu di iche iche megide: ọ gāga-kwa-ra ya nke-ọma rue mb͕e oké iwe gāgwusi; n'ihi na ihe akara àkà gēme.
37 Ma ọ gaghi-atughari uche na chi nile nke nna-ya-hà, ma-ọbu n'ihe ahu ndinyom nāchọsi ike, ọ bu kwa na chi nile ọ bula ka ọ nāgaghi-atughari uche: n'ihi na n'elu ihe nile ka ọ gēme onwe-ya uku.
38 Ma ọ bu chi nke ebe nile siri ike ka ọ gāsọpuru n'ọnọdu-ya: ọ bu kwa chi nke nna-ya-hà nāmaghi ka o gēji ọla-edo, ji kwa ọla-ọcha, ji kwa nkume di oké ọnu-ahia, ji kwa ihe di iche iche anāchọsi ike, sọpuru.