3 Ma ndi ahu ndi nwere uche ganēnwu ọcha dika onwunwu-ọcha nke mbara-ígwé; ndi nēme ọra madu ka ha ghọ ndi ezi omume ganāmu kwa dika kpakpando rue mb͕e nile ebighi-ebi.
4 Ma gi onwe-gi, Daniel, zobe okwu ndia, kachita kwa akwukwọ a akàrà, rue mb͕e ọgwugwu ihe ndia: ọtutu madu ganējeghari, ihe-ọmuma gāba kwa uba.
5 M'we hu, mu onwem, bú Daniel, ma, le, abua ọzọ nēguzo, otù onye n'otù usọ osimiri ahu, ibe-ya n'usọ osimiri nke-ọzọ.
6 Otù nime ha we si onye ahu nke yiri uwe ọcha, nke nọ n'elu miri nke osimiri ahu, Rùe ole mb͕e ka ọgwugwu oké ọlu ndia gādi?
7 M'we nu onye ahu nke yiri uwe ọcha, onye nọ n'elu miri nke osimiri ahu, o we welie aka-nri-ya na aka-ekpe-ya n'elu-igwe, were Onye ahu Nke nādi ndu mb͕e ebighi-ebi, si, na ọ gādiru otù mb͕e akara àkà, na mb͕e abua akara àkà, na nkera mb͕e akara àkà; ma mb͕e agāb͕ajisi aka nke ndi nsọ ahu, ihe nile ndia gāgwusi.
8 Mu onwem we nu, ma adighm-aghọta: m'we si, Onye-nwem, Gini bu mb͕e ikpe-azu nke ihe ndia?
9 O we si, La, Daniel: n'ihi na ezobewo okwu ndia, kachita kwa ha akàrà, rue mb͕e ọgwugwu ihe ndia.