Daniel
isiakwụkwọ 12:5-11
Bible Nso
5M'we hu, mu onwem, bú Daniel, ma, le, abua ọzọ nēguzo, otù onye n'otù usọ osimiri ahu, ibe-ya n'usọ osimiri nke-ọzọ.
6Otù nime ha we si onye ahu nke yiri uwe ọcha, nke nọ n'elu miri nke osimiri ahu, Rùe ole mb͕e ka ọgwugwu oké ọlu ndia gādi?
7M'we nu onye ahu nke yiri uwe ọcha, onye nọ n'elu miri nke osimiri ahu, o we welie aka-nri-ya na aka-ekpe-ya n'elu-igwe, were Onye ahu Nke nādi ndu mb͕e ebighi-ebi, si, na ọ gādiru otù mb͕e akara àkà, na mb͕e abua akara àkà, na nkera mb͕e akara àkà; ma mb͕e agāb͕ajisi aka nke ndi nsọ ahu, ihe nile ndia gāgwusi.
8Mu onwem we nu, ma adighm-aghọta: m'we si, Onye-nwem, Gini bu mb͕e ikpe-azu nke ihe ndia?
9O we si, La, Daniel: n'ihi na ezobewo okwu ndia, kachita kwa ha akàrà, rue mb͕e ọgwugwu ihe ndia.
10Ọtutu madu gēme onwe-ha ka ha di ọcha, ha gēme onwe-ha ka ha nwue ọcha, agānucha kwa ha; ma ndi nēmebi iwu gēmebi iwu; ndi nile nke nēmebi iwu agaghi-aghọta kwa ihe: ma ndi ahu ndi nwere uche gāghọta.
11Ma site na mb͕e agēwezuga àjà-nsure-ọku ahu anēsure mb͕e dum, mb͕e agēdo ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu, nnù ubọchi atọ na ọgu ubọchi anọ na iri gādi.