Daniel
isiakwụkwọ 2:23-29
Bible Nso
23Gi, Chineke nke nnam-hà, ka mu onwem nēkele, nāja kwa, n'ihi na amam-ihe na idi-ike ka I nyeworom, ub͕u a ka I mewo-kwa-ra ka m'mara ihe ayi riọrọ n'aka Gi: n'ihi na okwu eze ka I meworo ka ayi mara.
24N'ihi nka Daniel bàkuru Ariok, onye eze doro onye-isi ime ka ndi-amam-ihe nke Babilon la n'iyì: o jere, ọ bu kwa otú a ka ọ siri ya; Emela ka ndi-amam-ihe nke Babilon la n'iyì: me ka m'bata guzo n'iru eze, ọ bu kwa isi nrọ ahu ka m'gākọrọ eze.
25Mb͕e ahu Ariok were ọsọ me ka Daniel bata n'iru eze, ọ bu kwa otú a ka ọ siri ya, Achọputawom otù nwoke nime umu ndi Juda emere ka ha je biri n'ala ọzọ, onye gēme ka eze mara isi nrọ ahu.
26Eze zara, si Daniel, onye aha-ya bu Belteshaza, Ọ̀ gābu na i puru ime ka m'mara nrọ a nke m'huworo, na isi-ya?
27Daniel zara n'iru eze, si ihe-nzuzo nke eze juworo, ndi mara ihe na ndi-dibia na ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi nēkè elu-igwe apughi ikọrọ eze ya;
28ma Chineke di, Onye nọ n'elu-igwe, Nke nēkpughe ihe-nzuzo nile, O mewo kwa ka eze, bú Nebukadneza, mara ihe aghaghi idi n'ikpe-azu ubọchi ndia. Nrọ-gi, na ọhù nile nke isi-gi n'elu ihe-ndina-gi, nka ka ọ bu:
29gi onwe-gi, eze, èchìchè-gi nile rigotara n'uche-gi n'elu ihe-ndina-gi, ihe aghaghi idi mb͕e nka gasiri: Onye ahu nke nēkpughe ihe-nzuzo nile emewo kwa ka i mara ihe aghaghi idi.