Daniel 2:39-45 IGBOB

39 Ma n'ọnọdu gi ka ala-eze ọzọ gēbili nke gādi ala kari gi; na ala-eze ọzọ nke mere ha atọ, nke bu ọla, nke gēnwe ike n'aru uwa nka nile.

40 Ma ala-eze nke-anọ gādi ike ka ígwè: n'ihi na ígwè nētipia tida kwa ihe nile: na dika ígwè nke nētijisi ihe ndia nile, otú a ka ọ gētipia, tijisia.

41 Ma ebe i huru ukwu-ya abua na nkpisi-ukwu-ya nile, na ufọdu nime ha bu urọ ọkpu-ite, ma ufọdu nime ha bu ígwè, ala-eze ekewara ekewa ka ọ gābu; ma nguzosi-ike ufọdu nke ígwè ahu aghaghi idi nime ya, n'ihi na i huru ígwè ahu na agwakọtara ya na urọ apiti.

42 Ma nkpisi-ukwu nile nke ukwu-ya abua, ufọdu nime ha bu ígwè, ma ufọdu nime ha bu urọ, otú a ufọdu nime akuku ala-eze ahu gādi ike, ma ufọdu nime ya gābu ihe nādighi ike ntiwa.

43 Ma ebe i huru ígwè ahu na agwakọtara ya na urọ apiti, ha ganēji nkpuru ndi ọzọ gwakọta onwe-ha; ma ha agaghi-adi nārapara n'aru ibe-ha n'otù n'otù, ọbuná otú ígwè na urọ nādighi-agwakọta.

44 Ma n'ubọchi-ha, bú eze ndia, ka Chineke nke elu-igwe gēme ka otù ala-eze bilie, nke agaghi-emebi emebi rue mb͕e abighi-ebi, ọ bu kwa ọbubu-eze-ya ka anāgaghi-arapuru ndi ọzọ; ọ gētipia ala-eze ndia nile me ka ha gwusia, ma ya onwe-ya gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi.

45 N'ihi na i huru na awaputara otù nkume n'ugwu ahu nke anējighi aka wa, na o tipiara ígwè ahu na ọla ahu na urọ ahu na ọla-ọcha ahu na ọla-edo ahu; Chineke di uku emewo ka eze mara ihe aghaghi idi mb͕e nka gasiri: nrọ a nēguzosi kwa ike, ọ bu kwa ihe kwesiri ntukwasi-obi ka akukọ-isi-ya bu.