Daniel
isiakwụkwọ 5:26-31
Bible Nso
26Nka bu akukọ-isi ihe ahu: MENE; Chineke agutawo ala-eze-gi ọnu, me ka mb͕e-ya ruzue.
27TEKEL; atùwo gi n'ihe-ọtùtù, hu na ihe kọrọ nime gi.
28PERES; ekewawo ala-eze-gi, nye ndi Midia na ndi Peasia.
29Mb͕e ahu Belshaza kwuru okwu, ha we yibe Daniel uwe-ododo, yibe kwa ya iyab͕a ọla-edo n'olu-ya, kwusa okwu bayere ya, si na ọ gābu onye nāchi achi dika otù nime ndi-eze atọ n'ala-eze ahu.
30N'abali ahu ka eb͕uru Belshaza, bú eze Kaldea.
31Ma Daraiọs, bú onye Midia, natara ala-eze ahu mb͕e ọ b͕ara ihe ra ka ọgu arọ atọ na abua.