Daniel
isiakwụkwọ 6:19-25
Bible Nso
19Mb͕e ahu eze biliri n'isi-ututu, mb͕e chi bọrọ, o we were ọsọ garue olùlù ọdum.
20Mb͕e ọ nābiaru nso olùlù ahu n'ijekuru Daniel, ọ bu olu dika nke onye ihe nēwuta ka o jiri ti nkpu: eze zara, si Daniel, Daniel, gi orù nke Chineke di ndu, Chineke-gi, Onye gi onwe-gi nēfè mb͕e nile, Ọ̀ puru idọputa gi n'aka ọdum?
21Mb͕e ahu Daniel gwara eze okwu, si, Eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi.
22Chinekem ezitewo mọ-ozi-Ya, we kpuchita ọnu ọdum ndia, ha emerughkwam aru: n'ihi na n'iru Ya ọ bu emeghi-ihe-ọjọ ka ahuru nimem; ọzọ kwa, n'iru gi, eze, ọ dighi ihe-imeru-aru m'meworo.
23Mb͕e ahu ọ di eze nma n'anya nke-uku, o we si ka ha me ka Daniel rigoputa n'olùlù ahu. Ewe me ka Daniel si n'olùlù ahu rigota, ọ dighi kwa imeru-aru ọ bula ahuru n'aru-ya, n'ihi na ọ tukwasiri Chineke-ya obi.
24Eze we kwue, ha we me ka ndikom ahu bia, bú ndi borori Daniel ebubo, ọ bu kwa n'olùlù ọdum ka ha tubàra ha na umu-ha na ndi bu nwunye-ha; ha akēruteghi kwa ala olùlù ahu tutu ọdum enwe ike n'aru ha, tapia ọkpukpu-ha nile.
25Mb͕e ahu Daraiọs, bú eze, degara ndi nile di iche iche, na mba nile, na ndi nāsu asusu nile di iche iche, ndi bi n'uwa nka nile, akwukwọ-ozi, si; Ka udo-unu di uku.