Daniel
isiakwụkwọ 6:25-28
Bible Nso
25Mb͕e ahu Daraiọs, bú eze, degara ndi nile di iche iche, na mba nile, na ndi nāsu asusu nile di iche iche, ndi bi n'uwa nka nile, akwukwọ-ozi, si; Ka udo-unu di uku.
26Anēsite n'irum nye iwu, si, n'ebe nile ọ bula anāchi n'ala-ezem, ka madu nāma jijiji nātu egwu n'iru Chineke nke Daniel: N'ihi na Ya onwe-ya bu Chineke di ndu, Ọ nēguzosi kwa ike rue mb͕e nile ebighi-ebi, ala-eze-Ya bu kwa nke anāgaghi-emebi, ọchichi-Ya gādigide kwa rue ọgwugwu ihe nile:
27Ọ bu Onye-ndọputa, na Onye-nnaputa, na Onye nēme ihe-iriba-ama di iche iche na ihe-iju-anya di iche iche n'elu-igwe na n'uwa; Onye dọputaworo Daniel n'aka ọdum.
28Ihe ga-kwa-ra Daniel nka nke-ọma n'ọbubu-eze Daraiọs na n'ọbubu-eze Sairọs, bú onye Peasia.