15 Ma mu onwem, bú Daniel, o wutara mọm nime ọbọ́-ya, ọhù nile nke isim nēme kwa ka m'ma jijiji.
16 Abiarurum nso otù onye nime ndi ahu nēguzo ọtọ n'ebe ahu, ọ bu kwa ihe bu ezi okwu bayere ihe a nile ka m'riọrọ n'aka ya. O we gwam okwu, ọ bu kwa isi ọhù ndia ka o mere ka m'mara, si:
17 Anu uku ndia, nke di anọ, bu eze anọ, ndi gēsi n'ala bilie ọtọ.
18 Ma ndi nsọ nke Onye ahu nke kachasi ihe nile elu gānata ala-eze ahu, nwe ala-eze ahu rue mb͕e ebighi-ebi, ọbuná rue mb͕e nile ebighi-ebi.
19 Mb͕e ahu ka m'chọrọ ima ihe bu ezi-okwu bayere anu nke-anọ ahu nke puru iche nime ha nile, nke dikarisiri egwu, nke ezé-ya nile bu ígwè, mbọ-ya nile buru ọla; nke ripiara, tapia, were ukwu-ya nile zọtọ nke fọduru;
20 achọ-kwa-ram ima ihe bu ezi-okwu bayere mpi iri ahu nke di n'isi-ya, na mpi ọzọ ahu nke rigotara, nke mpi atọ da-kwa-ra n'ala n'iru ya; ọbuná mpi ahu nke nwere anya di iche iche na ọnu nke nēkwu oké ihe di iche iche, nke di uku kari ibe-ya nile n'ile ya anya.
21 Anọm nāhu, mpi ahu we nēbuso ndi nsọ agha, nwe ike imegide ha;