11 Ọ buru na agwọ ata aru tutu arà ya urà, ọ dighi kwa urù ọ gābara onye-nwe ire-utọ.
12 Okwu nile nke ọnu onye mara ihe di amara; ma eb͕ub͕ere-ọnu nke onye-nzuzu gēloda ya onwe-ya.
13 Nmalite okwu nile nke ọnu-ya bu nzuzu: nkwubì okwu-ọnu-ya bu kwa iwi-ara ọjọ.
14 Onye-nzuzu nēme kwa ka okwu ba uba: madu adighi-ama ihe ọ bula nke gādi adi; ọzọ, ihe gādi mb͕e ọ gasiri, ònye gēgosi ya?
15 Ndọb͕u nke ndi-nzuzu nādọb͕u onwe-ha n'ọlu nāgwu onye ọ bula nime ha ike, n'ihi na ọ maghi ijeru obodo.
16 Ahuhu gādiri gi, ala, mb͕e eze-gi bu nwata, mb͕e ndi-isi-gi nēri kwa ihe n'ututu!
17 Ihe nāgara gi nke-ọma, ala, mb͕e eze-gi bu nwa ndi amara aha-ha, mb͕e ndi-isi-gi nēri kwa ihe na mb͕e oriri, n'ihi idi-ike, ọ bughi kwa n'ihi iṅubiga-manya-ókè!