15 Ndọb͕u nke ndi-nzuzu nādọb͕u onwe-ha n'ọlu nāgwu onye ọ bula nime ha ike, n'ihi na ọ maghi ijeru obodo.
16 Ahuhu gādiri gi, ala, mb͕e eze-gi bu nwata, mb͕e ndi-isi-gi nēri kwa ihe n'ututu!
17 Ihe nāgara gi nke-ọma, ala, mb͕e eze-gi bu nwa ndi amara aha-ha, mb͕e ndi-isi-gi nēri kwa ihe na mb͕e oriri, n'ihi idi-ike, ọ bughi kwa n'ihi iṅubiga-manya-ókè!
18 Site n'okè ume-ngwu ka elu ulo nēze eze; site kwa n'ifanye aka n'ukwu ka ulo nēhi mmiri.
19 N'ihi ichì-ọchì ka anēsi nri, manya-vine nēme ka ndu ṅuria: ego nāza kwa ihe nile.
20 Ọbuná n'uche-gi akọchala eze; akọcha-kwa-la ọgaranya n'ime-ulo-ndina-gi: n'ihi na anu-ufe nke elu-igwe gēme ka olu-gi rue ya nti, ihe nwere nkù gēgosi kwa okwu ahu.