12 Mu onwem we che iru ihu amam-ihe, na iwi-ara na nzuzu: n'ihi na gini ka madu nke nēso eze n'azu gēme? ọ bu ihe nke ha meworo na mb͕e di anya gara aga.
13 Mu onwem we hu na amam-ihe kariri nzuzu, dika ìhè si kari ọchichiri.
14 Onye mara ihe, anya-ya abua di n'isi-ya, ma onye-nzuzu nējeghari n'ọchichiri: ma mu onwem amawo kwa na otù ndabà nādabàra ha nile.
15 Mu onwem we si n'obim, Dika o si dabàra onye-nzuzu, otú a ka ọ nādabàram, ọbuná mu onwem; ma n'ìhi gini kwa ka mu onwem mara ihe kari? M'we kwue okwu n'obim, si, na nka bu kwa ihe-efu.
16 N'ihi na ọ dighi ncheta diri onye mara ihe, dika ọ nēsighi adiri onye-nzuzu, rue mb͕e ebighi-ebi; n'ihi na ihe nke di na mb͕e di anya gara aga, n'ubọchi nke nābia ha nile gābu ihe echezọrọ echezọ. Ònye mara ihe si kwa aṅa nwua dika onye-nzuzu?
17 M'we kpọ ndu asì; n'ihi na ọ jọrọm njọ, bú ọlu nke aluworo n'okpuru anyanwu: n'ihi na ihe nile bu ihe-efu na ichọ ijide ifufe.
18 Mu onwem kpọ-kwa-ra ndọb͕um nile asì, bú nke mu onwem nādọb͕u onwem n'ọlu n'okpuru anyanwu: n'ihi na m'gārapuru ya madu nke gānọ mb͕e m'gasiri.