16 N'ihi na ọ dighi ncheta diri onye mara ihe, dika ọ nēsighi adiri onye-nzuzu, rue mb͕e ebighi-ebi; n'ihi na ihe nke di na mb͕e di anya gara aga, n'ubọchi nke nābia ha nile gābu ihe echezọrọ echezọ. Ònye mara ihe si kwa aṅa nwua dika onye-nzuzu?
17 M'we kpọ ndu asì; n'ihi na ọ jọrọm njọ, bú ọlu nke aluworo n'okpuru anyanwu: n'ihi na ihe nile bu ihe-efu na ichọ ijide ifufe.
18 Mu onwem kpọ-kwa-ra ndọb͕um nile asì, bú nke mu onwem nādọb͕u onwem n'ọlu n'okpuru anyanwu: n'ihi na m'gārapuru ya madu nke gānọ mb͕e m'gasiri.
19 Ma ònye mara ma ọ gābu onye mara ihe ma-ọbu onye-nzuzu? ma ọ gāchi ndọb͕um nile nke m'dọb͕uworo onwem n'ọlu, na nke m'meworo n'amam-ihe n'okpuru anyanwu. Nka bu kwa ihe-efu.
20 Mu onwem we chigharia ime ka obim ghara inwe ntukwasi-obi bayere ndọb͕u nile nke m'dọb͕ururi onwem n'ọlu n'okpuru anyanwu.
21 N'ihi na madu di nke ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu di n'amam-ihe, na n'ihe-ọmuma, na n'izi-ezi; ma ọ bu madu nke nādọb͕ughi onwe-ya n'ọlu nime ya ka ọ gēnye ya ka ọ buru òkè-ya. Nka bu kwa ihe-efu na ihe ọjọ nke riri nne.
22 N'ihi na gini ka madu nwere na ndọb͕u nile ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, na nime ncheb͕u nke obi-ya, nke ya onwe-ya nādọb͕u onwe-ya n'ọlu nime ya n'okpuru anyanwu?