2 Mu onwem we ja ndi nwuru anwu, bú ndi nwuru anwu na mb͕e di anya gara aga, kari ndi di ndu, bú ndi ahu nke nọ na ndu rue ub͕u a;
3 e, ọ di nma kari ha abua, bú onye akādighi, nke nāhughi ọlu ọjọ nke aluworo n'okpuru anyanwu.
4 Mu onwem we hu ndọb͕u nile madu nādọb͕u onwe-ha n'ọlu, ya na ọlu nile nāgafe agafe, na ọ bu n'ihi nka ka madu gābu onye madu-ibe-ya gēkwoso ekworo. Nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.
5 Onye-nzuzu nākpakọba aka-ya abua, nēri kwa anu-aru onwe-ya.
6 Ọ di nma, bú otù nju-aka n'izu-ike, kari nju-aka abua n'idọb͕u onwe-gi n'ọlu na ichọ ijide ifufe.
7 Mu onwem we laghachi, hu ihe-efu n'okpuru anyanwu.
8 Ọ di otù onye nke nání ya di, ọ dighi kwa onye abua ọ nwere; ọ dighi kwa nwa ma-ọbu nwa-nne o nwere; ma ọ dighi nsọtu diri ndọb͕u-ya nile ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, afọ adighi-eju kwa anya-ya n'àkù. Ọ nāsi, Ọ̀ bu kwa n'ihi onye ka mu onwem nādọb͕u onwem n'ọlu, we me ka ezi ihe kọnari nkpuru-obim? Nka bu kwa ihe-efu, e, nweda-n'ala jọrọ njọ ka ọ bu.