22 N'ihi na ọtutu mb͕e obi-gi maworo na gi onwe-gi akọchawo ndi ọzọ.
23 Ihe nile a ka m'nwaworo n'amam-ihe: m'siri, M'gāma ihe; ma nke ahu di anya n'ebe m'nọ.
24 Ọ di anya, bú ihe nke diworo, o mi-kwa-ra emi nke-uku; ònye gāchọputa ya?
25 M'chighariri, mu onwem na obim, ima na iledo, na ichọsi amam-ihe na ichè-èchìchè ike, na ima na nmebi-iwu bu nzuzu, ima kwa na nzuzu bu iwi-ara:
26 mu onwem achọtawo kwa ihe di ilu kari ọnwu, bú nwayi ahu nke obi-ya bu ọnyà ọnyà na ub͕u ub͕u, ab͕u ka aka-ya abua bu: onye di nma n'iru Chineke gēsi n'aka nwayi ahu wepuga onwe-ya; ma ọ gānwude onye-nmehie.
27 Le, nka ka m'chọtaworo, ka Onye-nkpọkọta siri, nātukwasi otù ihe n'ihe ọzọ, ichọta ichè-èchìchè:
28 nke nkpuru-obim nọ nāchọsi ike rue ub͕u a, ma achọputaghm ya: otù madu n'etiti nnù madu abua na ọgu iri ka m'chọtaworo; ma ọ dighi otù nwayi nime ndi ahu nile ka m'chọtaworo.