Emos 2 IGBOB

1 Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Moab, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na o surere ọkpukpu eze Edom me ka ha ghọ nzu:

2 ma M'gēzite ọku na Moab, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Keriot; Moab gānwu kwa anwu na nkpọtu, na n'iti-nkpu agha, na n'olu opì-ike:

3 M'gēbipu kwa onye-ikpe n'etiti ya, b͕ue ya na ndi-isi-ya nile; otú a ka Jehova siri.

4 Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Juda, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha juworo iwu Jehova, ọ bu kwa ukpuru-Ya nile ka ha nēdebeghi, okwu-ugha-ha nile, nke ndi bu nna-ha jeroso, we dufue ha:

5 ma M'gēzite ọku na Juda, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Jerusalem.

6 Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Israel, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha reworo onye ezi omume n'ọla-ọcha, re kwa ob͕eye n'ihi akpukpọ-ukwu abua:

7 ha bu ndi nēghekpọso ájá ala n'isi ndi nēnweghi ike, ọ bu kwa uzọ ndi di ume-ala n'obi ka ha nēwezuga: ọzọ, nwoke na nna-ya nējekuru otù nwa-ab͕ọghọ ahu, ka ha we me ka aha nsọm ghara idi nsọ:

8 ọ bu kwa n'elu uwe anaraworo n'ihe-ibe ka ha nēseti onwe-ha n'akuku ebe-ichu-aja nile ọ bula, ọ bu kwa manya-vine nke ndi eriworo ha nra ka ha nāṅu n'ulo Chineke-ha.

9 Ma Mu onwem kpochapuru ndi-Amorait n'iru ha, onye idi-elu-ya di ka idi-elu osisi cedar, onye di ike ka ọ bu kwa, dika osisi oak; ma ekpochapurum nkpuru-ya n'elu na nkpọrọgwu-ya nile n'okpuru.

10 Ọ bu kwa Mu onwem mere ka unu si n'ala Ijipt rigoputa, M'me-kwa-ra ka unu je ije n'ọzara ọgu arọ abua, ka unu we nweta ala ndi-Amorait.

11 Eme-kwa-ram ka ufọdu nime umu-unu bilie ibu ndi-amuma, ufọdu nime umu-okorọbia-unu kwa, ibu ndi-Nazirait. Ọ̀ bughi nọ̄ ezie, bú nka, unu umu Israel? Ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

12 Unu we me ka ndi-Nazirait ṅua manya-vine; ọ bu kwa ndi-amuma ka unu nyere iwu, si, Unu ebula amuma.

13 Le, Mu onwem gābiada unu n'ọnọdu-unu, dika ub͕ọ-ala nke juputara n'ùkwù ọka si abiada.

14 Ebe-nb͕alaga gālanari kwa onye ukwu ọsọ n'iyì, onye di ike agaghi-ab͕a kwa ike-ya ume, dike agaghi-ewepuga onwe-ya:

15 onye nāchi uta agaghi-eguzo kwa; onye ukwu-ya abua di nfe n'ib͕a ọsọ agaghi-ewepuga kwa onwe-ya: onye nānọkwasi n'inyinya agaghi-ewepuga kwa onwe-ya:

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9