Emos 8 IGBOB

1 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova mere ka m'hu: ma le, otù nkata nkpuru-osisi nke mb͕e nghọkọta-nkpuru.

2 O we si, Gini ka gi onwe-gi nāhu, Emos? M'we si, Otù nkata nke nkpuru-osisi nke mb͕e nghọkọta-nkpuru. Jehova we sim, Ọgwugwu abiaruwo ndim, bú Israel, aru; M'gaghi-agabiga kwa nmehie-ya ọzọ.

3 Abù nile nke ulo uku Chineke gāghọ kwa ikwasi-ákwá-ike n'ubọchi ahu; (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ọtutu ka ozu di; n'ebe nile ọ bula ka etufuworo ha: nọdu du!

4 Nurunu nka, unu ndi nēkusi ume ike ilo ob͕eye, ndi nāchọ kwa ime ka ndi ala-unu ewedara n'ala kwusi,

5 si, Òle mb͕e ọnwa ọhu gāgabiga, ka ayi we re ọka? na ubọchi-izu-ike, ka ayi we cho ọka wheat? n'ime ka ọtùtù ephah di ntà, na ime ka ego shekel di uku, na ime ka ihe-ọtùtù aghughọ b͕agọrọ;

6 ib͕a ndi nēnweghi ike n'ọla-ọcha, na ib͕a ob͕eye n'ihi akpukpọ-ukwu abua, ọ bu kwa ọka wheat afuchapuru ka ayi gēre.

7 Jehova ejiwo npako Jekob ṅua iyi, si, Agaghm-echezọ ọlu nile ha ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi.

8 Ala, ọ̀ gaghi-ama jijiji n'ihi nka? onye ọ bula nke bi nime ya, ọ̀ gaghi-eru kwa újú? e, ọ gērujucha dika osimiri Nail; ọ gāmaghari amaghari kwa, tacha, dika osimiri Nail nke Ijipt.

9 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), na M'gēme ka anyanwu da n'etiti-ehihie, M'gēme kwa ka uwa b͕a ọchichiri mb͕e chi bọchara abọcha.

10 M'gāb͕anwe kwa ememe nile unu ka ha ghọ iru-újú, na abù nile unu, ka ha ghọ abù-ákwá; M'gēme kwa ka ákwà-nkpe biakwasi n'úkwù nile, na isi-nkwọcha n'isi nile ọ bula; M'gēme kwa ya ka ọ di ka újú anēruru nwa-nwoke amuru nání ya, M'gēme kwa ka mb͕e ikpe-azu ya di ka ubọchi nēlu ilu.

11 Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), mb͕e M'gēzite oké unwu n'ala, ọ bughi oké unwu nke nri, ọ bughi kwa akpiri-ikpọ-nku miri, kama ọ bu nke inu okwu nile nke Jehova.

12 Ha gāṅaghari kwa site n'otù oké osimiri rue oké osimiri ọzọ, site kwa n'Ugwu we rue n'Ọwuwa-anyanwu; ha gāb͕aghari iru na azu ichọ okwu Jehova, ma ha agaghi-achọta ya.

13 N'ubọchi ahu ka umu-ab͕ọghọ mara nma ndi nāmaghi nwoke gāda #mbà, ha na umu-okorọbia, site n'akpiri-ikpọ-nku.

14 Ndi ji ikpe-ọmuma Sameria aṅu iyi, si, Chineke-gi nādi ndu, Dan; na, Uzọ Bia-sheba nādi ndu; ha gāda kwa, ghara ibili kwa ọzọ.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9