Emos 5 IGBOB

1 Nurunu okwu a nke Mu onwem nēbuli n'isi unu ka ọ buru abù-ákwá, unu ulo Israel.

2 Nwa-ab͕ọghọ Israel nke nāmaghi nwoke adawo; ọ gaghi-ebili ọzọ: atusawo ya n'ala-ya; ọ dighi onye nēme ka o bilie.

3 N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Obodo ahu nke chiri nnù ndi-agha abua na ọgu iri apu gēnwe ọgu ise fọduru, nke chiri ọgu ise apu gēnwe kwa iri fọduru ulo Israel.

4 N'ihi na otú a ka Jehova siri ulo Israel, Chọnum, we di ndu:

5 ma unu achọla Bet-el, unu abà-kwa-la na Gilgal, unu agabiga-kwa-la ijeru Bia-sheba: n'ihi na aghaghi ime ka Gilgal je biri n'ala ọzọ, Bet-el gāghọ kwa ajọ ihe.

6 Chọnu Jehova, we di ndu; ka O we ghara ibia ike ike dika ọku n'ulo Josef, o we ripia, ọ gaghi-adi kwa onye nēmenyu ya nime Bet-el:

7 unu ndi nāb͕anwe ikpé ziri ezi ka ọ ghọ wormwood, ndi nātọb͕ọ kwa ezi omume n'ala;

8 chọnu Onye nēme Pleiades na Orion, Nke nāb͕anwe onyinyo ọnwu ka ọ ghọ ututu, Nke nēme kwa ka ehihie b͕a ọchichiri dika abali; Onye ahu Nke nākpọ miri nke oké osimiri òkù, we wusa ha ala; Jehova bu aha-Ya;

9 Onye ahu Nke nēme ka nbibi b͕ukwasi onye di ike dika àmùmà, nbibi ewe biakwasi ebe ewusiri ike.

10 Ha nākpọ onye nāba nba n'ọnu-uzọ-ama asì, ọ bu kwa onye nēkwu okwu n'izu-okè ka ha nākpọ onye-árú.

11 N'ihi nka, ebe unu nāzọb͕u onye nēnweghi ike, ebe unu nānara kwa ya ọka wheat n'ùtú: ulo nkume awara awa ka unu wuworo, ma unu agaghi-ebi nime ha; ubi-vine anāchọsi ike ka unu meworo, ma unu agaghi-aṅu manya-vine-ha.

12 N'ihi na amawom na ihe bara uba ka njehie-unu bu, na ihe di ike ka nmehie nile unu bu; unu ndi nākpab͕u onye ezi omume, ndi nānara ihe-nb͕aputa, ma ọ bu umu-ob͕eye di n'ọnu-uzọ-ama-unu ka unu nēwezuga n'ikpe-ha.

13 N'ihi nka onye nwere uche gēdere du n'oge ahu; n'ihi na oge ọjọ ka ọ bu.

14 Chọnu ezi ihe, achọ-kwa-la ihe ọjọ, ka unu we di ndu: Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, ewe si otú a nọnyere unu, otú unu siri.

15 Kpọnu ihe ọjọ asì, hunu ezi ihe n'anya, menu ikpé ziri ezi ka o guzosie ike n'ọnu-uzọ-ama: eleghi anya Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, gēmere ndi Josef fọduru amara.

16 N'ihi nka ka Jehova bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Onye-nwe-ayi, jiri si otú a: N'amá nile ka otiti-aka-n'obi gādi; ọ bu kwa n'èzí nile ka ha gāsi, Éwù! éwù! ha gākpọ kwa onye-ubi ibia iru-újú, kpọsa-kwa-ra ndi mara igu awa otiti-aka-n'obi.

17 Ọ bu kwa n'ubi-vine nile ka otiti-aka-n'obi gādi: n'ihi na M'gāgabiga n'etiti gi; otú a ka Jehova siri.

18 Ahuhu diri unu ndi nāchọsi ubọchi Jehova ike! ùrù gini ka ubọchi Jehova gābara unu? ubọchi ahu bu ọchichiri, ọ bughi ìhè.

19 Dika agāsi na otù onye nāb͕apu n'iru ọdum, anu-ọhia bear we zute ya; o we ba n'ulo-ya dabere aka-ya na mb͕idi, agwọ we ta ya.

20 Ọ̀ bughi ọchichiri ka ubọchi Jehova gābu, nke nābughi ìhè? ọ̀ gaghi-ab͕a kwa oké ọchichiri, nke onwunwu ọ bula nādighi ya?

21 Akpọwom ememe nile unu asì, ju ha, M'gaghi-anu kwa ísì utọ n'ubọchi-nb͕ochi nile unu.

22 N'ihi na ọ buru na unu esurerem àjà-nsure-ọku nile na onyinye-inata-iru-ọma nile unu, ha agaghi-atọm utọ: ọ bu kwa àjà-udo nke anu mara abuba nile unu ka M'nāgaghi-elegide.

23 Wezuga n'arum ùzù abù-gi nile; ọ bu kwa ọkpukpọ une-gi nile ka M'nāgaghi-anu.

24 Ma ka ikpé ziri ezi nērùdasi ike dika miri, ezi omume kwa dika miri-iyi nke nērù mb͕e dum.

25 Ọ̀ di àjà di iche iche na onyinye-inata-iru-ọma unu wetaram n'ọzara ọgu arọ abua, unu ulo Israel?

26 É-è, kama unu eburuwo ulo-ikwū nke eze-unu na Kaiun, bú onyinyo-unu, bú kpakpando nke chi-unu, nke unu mere onwe-unu.

27 M'gēme kwa ka unu je biri n'ala ọzọ n'ofè Damaskọs, ka Jehova, Onye aha-Ya bu Chineke nke usu nile nke ndi-agha, siri.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9