2 ma M'gēzite ọku na Moab, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Keriot; Moab gānwu kwa anwu na nkpọtu, na n'iti-nkpu agha, na n'olu opì-ike:
3 M'gēbipu kwa onye-ikpe n'etiti ya, b͕ue ya na ndi-isi-ya nile; otú a ka Jehova siri.
4 Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Juda, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha juworo iwu Jehova, ọ bu kwa ukpuru-Ya nile ka ha nēdebeghi, okwu-ugha-ha nile, nke ndi bu nna-ha jeroso, we dufue ha:
5 ma M'gēzite ọku na Juda, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Jerusalem.
6 Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Israel, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha reworo onye ezi omume n'ọla-ọcha, re kwa ob͕eye n'ihi akpukpọ-ukwu abua:
7 ha bu ndi nēghekpọso ájá ala n'isi ndi nēnweghi ike, ọ bu kwa uzọ ndi di ume-ala n'obi ka ha nēwezuga: ọzọ, nwoke na nna-ya nējekuru otù nwa-ab͕ọghọ ahu, ka ha we me ka aha nsọm ghara idi nsọ:
8 ọ bu kwa n'elu uwe anaraworo n'ihe-ibe ka ha nēseti onwe-ha n'akuku ebe-ichu-aja nile ọ bula, ọ bu kwa manya-vine nke ndi eriworo ha nra ka ha nāṅu n'ulo Chineke-ha.