2 O rue, mb͕e ha ripiasiri ihe-ọkukú nile nke ala, na m'siri, Onye-nwe-ayi Jehova, biko, b͕aghara: Jekob, ò gēsi aṅa guzosie ike? n'ihi na onye ntà ka ọ bu.
3 Jehova chèghariri uche bayere nka: Ọ gaghi-adi, ka Jehova siri.
4 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova mere ka m'hu: ma, le, Jehova nākpọ òkù ka Ya na ndi-Ya kpe ikpe site n'ọku; o we ripia oké ob͕u-miri, we nēripia òkè a, bú ala Israel.
5 M'we si, Onye-nwe-ayi Jehova, biko, rapu: Jekob, ò gēsi aṅa guzosie ike? n'ihi na onye ntà ka ọ bu.
6 Jehova chèghariri uche bayere nka: Nka agaghi-adi kwa, ka Onye-nwe-ayi Jehova siri.
7 Otú a ka O mere ka m'hu: ma, le, Onye-nwe-ayi nēguzo Onwe-ya n'akuku mb͕idi ejiri opù eji atù mb͕idi lua, ọ bu kwa n'aka-Ya ka opù eji atù mb͕idi di.
8 Jehova we sim, Gini ka gi onwe-gi nāhu, Emos? M'we si, Opù eji atù mb͕idi; Onye-nwe-ayi we si, Le, M'gaje ido opù eji atù nb͕idi n'etiti ndim, bú Israel; M'gaghi-agabiga kwa nmehie-ha ọzọ: