5 M'we si, Onye-nwe-ayi Jehova, biko, rapu: Jekob, ò gēsi aṅa guzosie ike? n'ihi na onye ntà ka ọ bu.
6 Jehova chèghariri uche bayere nka: Nka agaghi-adi kwa, ka Onye-nwe-ayi Jehova siri.
7 Otú a ka O mere ka m'hu: ma, le, Onye-nwe-ayi nēguzo Onwe-ya n'akuku mb͕idi ejiri opù eji atù mb͕idi lua, ọ bu kwa n'aka-Ya ka opù eji atù mb͕idi di.
8 Jehova we sim, Gini ka gi onwe-gi nāhu, Emos? M'we si, Opù eji atù mb͕idi; Onye-nwe-ayi we si, Le, M'gaje ido opù eji atù nb͕idi n'etiti ndim, bú Israel; M'gaghi-agabiga kwa nmehie-ha ọzọ:
9 ebe nile di elu nke Aisak gātọb͕ọ kwa n'efu, ebe nsọ nile nke Israel gāghọ kwa nkpọnkpọ ebe; M'gēji kwa mma-agha bilie imegide ulo Jeroboam.
10 Amazaia, bú onye-nchu-àjà Bet-el, we zigara Jeroboam, bú eze Israel, ozi, si, Emos ekekọtawo madu imegide gi n'etiti ulo Israel: ala apughi inagide okwu-ya nile.
11 N'ihi na otú a ka Emos siri, Site na mma-agha ka Jeroboam gānwu, aghaghi ime kwa ka Israel si n'ala-ya je biri n'ala ọzọ.