4 Bilie; n'ihi na okwu a diri gi, ayi onwe-ayi nọye-kwa-ra gi: di ike, me kwa ya.
5 Ezra we bilie, me ndi-isi nke ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na Israel nile, ka ha ṅua iyi ime dika okwu a si di. Ha we ṅua iyi.
6 Ezra we si n'iru ulo Chineke bilie, jerue ime-ulo Jehohanan nwa Elaiashib: o we je n'ebe ahu, ma o righi nri, ọ ṅughi kwa miri: n'ihi na o nēru újú n'ihi nmekpu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ.
7 Ha we kwusa nime Juda na Jerusalem gwa umu nile nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ka ha chikọta onwe-ha na Jerusalem;
8 ka ewezuga kwa àkù-ya nile ibibi ya, kewapu kwa onye ahu na nkpọkọta ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú onye ọ bula nke nābiaghi n'ubọchi atọ, dika ndum-ọdu ndi-isi na ndi-okenye si di.
9 Ndikom nile nke Juda na Benjamin we chikọta onwe-ha na Jerusalem n'ubọchi atọ; nke ahu bu ọnwa nke-iteghete, n'ubọchi nke-orú n'ọnwa ahu: ndi ahu nile we nọdu n'amá ulo Chineke, nāma jijiji n'ihi okwu a, na site n'oké miri-ozuzo nile.
10 Ezra, bú onye-nchu-àjà, we bilie, si ha, Unu onwe-unu emekpuwo emekpu, luta ndinyom ala ọzọ, itukwasi ihe n'ikpe-ọmuma Israel.