60 umu Delaia, na umu Tobaia, na umu Nekoda, nnù na ọgu iri-na-abua na iri na abua.
61 Site kwa n'umu ndi-nchu-àjà: umu Habaia, na umu Hakoz, na umu Bazilai, onye luru nwunye sitere n'umu-ndinyom Bazilai, bú onye Gilead, ewe kpọ ya aha n'aha-ha.
62 Ndia chọrọ odide-akwukwọ-ha n'etiti ndi edere n'akwukwọ-osuso-ọmumu, ma achọtaghi ha: ewe gua ha na ndi nādighi nsọ, ewe wepu ha n'ọlu-nchu-àjà.
63 Tiashata we si ha, ka ha ghara iri ihe n'ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile, rue mb͕e onye-nchu-àjà gēwere Ìhè na Izu-okè guzo.
64 Nkpọkọta ahu nile n'otù di orú nnù uzọ ise na nnù ise na ọgu iri-na-asatọ,
65 nāgughi orù-ha ndikom na orù-ha ndinyom, ndi di nnù iri-na-asatọ na ọgu isi na iri na asa: ha nwe-kwa-ra ọgu madu iri, bú ndikom nābù abù na ndinyom nābù abù.
66 Inyinya-ha di nnù na ọgu iri-na-isi na iri na isi; inyinya mule ha di ọgu iri-na-abua na ise;